Malachi 4

Ikpe ọmụma na ime ka ọgbụgba ndụ sie ike

Nʼakwụkwọ ndị Hibru, isi nke Anọ, site nʼamaokwu nke mbụ ruo na nke isii, bụ nke edepụtara dịka isi nke Atọ, amaokwu nke iri na itoolu ruo nke iri abụọ na anọ.
1“Nʼezie, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ ga-erekwa ọkụ dịka ebe a funyere ọkụ buru ibu. Mgbe ndị nganga, ndị na-eme ihe ọjọọ, ga-abụ igbugbo ọka, ụbọchị ahụ na-abịa ga-erechapụ ha,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. “Ọ dịkwaghị mgbọrọgwụ maọbụ alaka ọbụla ga-afọdụrụ ha. 2Ma unu bụ ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-achawapụta wetakwara unu ọgwụgwọ nke si nʼime nku ya. Unu ga-apụkwa, na-awụgharị dịka ụmụ ehi eji nri zujuo afọ. 3Mgbe ahụ, unu ga-azọpịakwa ndị ajọ omume. Ha ga-aghọkwa ntụ nʼokpuru ọbụ ụkwụ unu, nʼụbọchị ahụ m ga-eme ihe ndị a,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

4“Chetanụ iwu Mosis, bụ odibo m, ya bụ iwu na ụkpụrụ ndị ahụ dị iche iche m nyere ya na Horeb, maka Izrel niile.

5“Lee, aga m ezitere unu Ịlaịja onye amụma, tupu ụbọchị ukwu ahụ dị oke egwu bụ ụbọchị Onyenwe anyị abịa. 6Ọ ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharịkwute ụmụ ha, meekwa ka obi ndị bụ ụmụ chigharịkwutekwa nna ha; ka m ghara ịbịa ma jiri ịbụ ọnụ laa ala ahụ nʼiyi.”

Copyright information for IboBIU